MGBASA EJEMOZI ỤKA MMỤỌ NSỌ NA NAỊJIRỊA KAMGBE AGHA BIAFRA NA NAỊJIRỊA BIRI: ETU IHE SI GBATA KWỤRỤ

Authors

  • Daniel Ihunanya Ilechukwu
  • Chiamaka Patience Ilechukwu

Abstract

Ụ mị Edemede
Ndị ka Mmụọ Nsọ bụ ndị nkụzi ha, ozizi ha na nkwenye ha gbadoro ụkwụ n‘ike nke
Mmụọ Nsọ Chineke. Ha na-agbaso usoro ofufe a haziri ahazi ma na-agba mbọ ịkụzi ihe dị
n‘Akwụkwọ Nsọ n‘agbanweghị ya. Onye ọbụla dị n‘otu usoro ekpemekpe a ka a na-akpọ na
Bekee (a pentecostal). Ihe gbasara ha na ije ozi ha ka a na-akpọ (pentecostalism). Ederede a
chọpụtara mgbe ije ozi ndị ụka Mmụọ Nsọ malitere, ihe bụ ebumnobi ha mgbe ha malitere
ọhụrụ, agamnihu ha kamgbe ha malitere na ụ rụ dị iche batarala n‘ije ozi ha tụmadụ n‘oge
ugbu a. E ji ụfọdụ n‘ime ha a ma ama na Naịjiria mere ebe mgbado ụkwụ nnyocha ederede
a. ka Mmụọ Nsọ malitere na Naịjirịa na mbido 1970. Ederede a gbara ndahie ndị ndu ha
n‘anwụ n‘agbanyeghị ezi ebumnobi ha ji malite. Nke a mere ezi ebumnobi ndị a ji akpụzi
afọ n‘ala taataa. Ederede a gosipụtara ndahie ndị isi ụka Mmụọ Nsọ ma gbaa ndị ka kwụ
chịm n‘okwukwe ha ume ka ha na-aga n‘ihu n‘ezi ọrụ ha. Ederede a bụ nke nkọwasị, n‘ihi
ya e jighị atụtụ ọ bụla nyocha ya. Ederede a ga-eme ka ndị hierela ụzọ n‘ ka Mmụọ Nsọ
chighakwute Chineke ma meghee anya ndị a na-achọ iduhie ụzọ ka a ghara idupu ha
n‘okwukwe. E nyere ndụmọdụ ka ndị niile bụ ndị otu ka Mmụọ Nsọ gbaa mbọ wepụ oke
ọchịchọ, amụma ụgha, oke ịchụ nta ego na arụrụala ndị ọzọ dị iche iche ka Chineke wee jiri
ụka a rụpụta ebumnobi Ya n‘ọ gbọ a gbagọrọ agbagọ. Usoro nkanye akara ụda olu a gbasoro
bụ nke Green na Igwe 1963. N‘ụdịdị a, a gaghị akanye ụda elu, mana a ga-akanye ụda ala na
ụda nsụda.

Downloads

Published

2022-12-15