ARỤMỌRỤ JI N’ALA NGWA: NTỤLE NKE UGBU A NA NKE GBOO

Authors

  • Chinenye C. Olekaibe, Ph.D.
  • Basilica N. Eweoma, Ph.D.
  • Andrew C. Mgborogwu

Abstract

Ụmị Edemede
Ji bụ otu n‘ime ihe gbara ọkpụrụkpụ a na-akọpụta n‘ọrụ ubi e ji mara ndị Ngwa. Ndị Ngwa
na-akọpụta ji ebe ọ na-ada ụda mere ha ji hiwe emume ichi Ezeji iji sọpụrụ ma kwanyere
ụmụ nwoke na-arụpụtakarịcha ji n‘ala ha ugwu. Ndị Ezeji n‘ala Ngwa na-enwe ọba ji bụ
anya bịa lere iji wee tozuo ituru ugo a n‘ihi na ọ bụ ọkwa e ji ama ndị bụ dimkpa na
ọgaranya n‘oge mgbe ochie. Mana ka ọ dị taa, ọnọdụ a agbanweela. Ji dị iche iche e ji mara
ndị Ngwa bụzị ihe anya anazịghị ahụ n‘ihi enwezịghị ndị na-arụ ha. Ọnọdụ a ji nọ n‘ala
Ngwa ugbu a bụ ihe kpaliri mmụọ ndị odee mere ha ji chọ itule ọnọdụ arụmọọrụ ji n‘ala
Ngwa, nke ugbu a na nke gboo. Nchọcha a chọpụtara na ala Ngwa bụ oke mba e ji ịrụpụta ji
ebe ọ dị ukwuu wee mara n‘oge gboo, na e nwere ụdị ji dị iche iche e ji mara ha, na ha naakwanyere ndị kacha arụpụta ji ugwu site n‘ichi ha Ezeji, na ha na-eme iri ji ọhụrụ iji nabata
ji ọhụrụ n‘ala ha nakwa ọtụtụ nsọ ha nweere ji. Ka ọ dị taa ha chọpụtakwara na ọnọdụ
nrụpụta ji n‘ala Ngwa alaala azụ. Ha nyere ndụmọọdụ ka ndị Ngwa gbalịa laghachi azụ
n‘ejirimara ha na ọ ga-enye aka ịkwalite ụzọ obibi ndụ ha. Ndị nchọcha ji ajụjụ ọnụ ha gbara
na ihe ndị ha nwetara n‘ọbaakwụkwọ mere ihe.

Downloads

Published

2022-12-15