ỊGBAMA IHE ỊRỊBA AMA GAJE IME N’ỌDỊNIIHU DỊ KA A HỤTARA N’AKWỤKWỌ EJIJI IGBO ỤFỌDỤ

Authors

  • Obiageli Theresa Nsolibe, Ph.D.

Abstract

Ụmi edmede
Edemede a gbadoro ụkwụ n‘ibu amụma maọbụ ịgba ama ihe ịrịba ama gaje ime n‘ọdịnihu.
Ọ nwere ihe ga-abụ ọ mee, o bụrụ ihe iju anya nye ndị mmadụ. dị ihe dị otu ahụ gụnyere
anụụlọ ibido bewe akwa n‘etiti ehihe maọbụ n‘etiti abalị, ikwighikwighi ibe n‘etiti abalị,
ụkwụ aka ekpe ịkpọ mmadụ, anya ịdọ mmadụ pem pem pem na ụmụ ihe ndị ọzọ ahụtaghị ka
ihe dịbu adị. Ime ka ndị mmadụ mata na ụmụ ihe ndị ahụ anaghị eme na nkịtị na o nwere ihe
ọ na-eme ka a mata gaje ime kpaliri mmụọ odee ide n‘isiokwu a maka na ụfọdụ ndi mmadụ
na-asị na o nweghi ihe ọbụla gaje ime. Odee ji akwụkwọ ejije atọ e dere were nyochaa
isiokwu a. Ọ gbasoro usoro nnyocha sọvee. A chọpụtara na ụmụ ihe ụfọdụ na-eme dị ka
ụmụ nnụnụ ibe n‘etiti ehihie maọbụ abalị, anụ ụlọ ibekwa n‘ụdị oge ahụ, ụkwụ aka ekpe
ịkpọbi mmadụ na ihe irịba ama ndị ọzọ nwekwara ike e si na nrọ gosi, nwere ihe ha na-agba
ama ya gaje ime. Ha na-agba ama ihe ọjọọ maọbụ ihe ọma ga-eme nọdịniihu. A
chọpụtakwara na e nwere ike gbochie ihe ọjọọ gaje ime ma a gbaa ama ya n‘ụzọ ndị a e
kwuru n‘elu site n‘ije na nke dibịa afa maọbụ na nke ndị ekpere ka ha kwuo ihe a ga-eme iji
medaa ndị mmụọ obi maọbụ kpeere Chukwu ka o gbochie ihe ahụ ka ọ ghara ịbịa na
mmezu. Edemede a ga-abara ọhanaeze uru site n‘ ime ha Amata na ihe ụfọdụ anaghị
anọkata mewe na o nwere ihe na-akpata ya. Nke a ga-eme ha hụ ụdị ihe ahụ ka ha chọọ ụzọ
igbochi ya ka nsogbu ghara ịdị. Nke a bụ alo a na-atụ n‘ edemede a.

Downloads

Published

2022-12-15