ỊGBA NDỤ N’OBODO ỤFỌDỤ N’ALA IGBO: NZIPỤTA AGBAMNDỤ N’AGỤMAGỤ IGBO NDỊ A HỌỌRỌ

Authors

  • Ogochukwu Roseline Ifeka, Ph.D.

Abstract

Ụmị Edemede
Ọtụtụ nsogbu ezinaụlọ ndị Igbo na-agabiga n‘oge a mere na ha anaghị atụkwasị obi n‘ebe
ibe ha nọ. Ha na-ahụta onye ọbụla nọ ha nso dị ka onye a ga-eze ndụ. fọdụ ndị isi ụka
ọgbara ọhụrụ na-akọnye ndị mmadụ ụjọ n‘ahụ gbasara ibe ha. Nke a kpalitere mmụọ
nchọcha isiokwu a bụ ―Ịgba Ndụ n’Ala Ig o”. Site n‘ịgba ndụ ka a ga-esi kpọghachi mmụọ
ndị na-eche na ibe ha chọrọ igbu ha maọbụ nye ha nsị. E lebara anya n‘obodo atọ dị n‘ Steeti
Anambara: Alọ (Idemmili Saụtụ), Uli (Ihiala) na Ọkụzụ (Oyi), iji zipụta ihe bụ ịgba ndụ
n‘obodo ndị a họọrọ n‘otu n‘otu. A gbaara ọhanaeze n‘anwụ etu obodo ndị a si eme nke ha,
usoro na oge ha ji eme ya. E ji usoro nkọwasị wee mee nchọcha a wee zipụta n‘uju ihe a tụrụ
anya n‘ịgba ndụ n‘ala Igbo ọ kachasị n‘obodo ndị e ji mere ebe mgbakwasa ụkwụ.

Downloads

Published

2022-12-15