IJELE: AKAMGBA CHERE YA DỊ KA MMỌNWỤ NA ỌRỤ NKA NDỊ IGBO

Authors

  • Charles Azụbụike Nneke, PhD

Abstract

Ụmị Edemede

Ijele dị ka mmọnwụ na ọrụnka pụtara ihe nke ukwuu na ndụ ndị Igbo. Ọ bụ etu ahụ ka o si
nwe ọtụtụ akamgba chere ya n‘ihi na ọ bụ ka onye ha ka isi na-awa ya ha. E si n‘edemede
nchọcha a wee lebaa anya n‘akamgba chere mmọnwụ Ijele, bụ ndị na-eme ka ọ daa ada. Ha
gụyere: ikuku, ozizo mmiri, na anwansị dị ka ịkọ nsị na ife ajụ. N‘aka nke ọzọ usoro obibi
ndụ ọgbara ọhụụ dị ka ekpemekpe, agụmakwụkwọ na ọrụ Bekee nke enyeghi ụmụ Igbo
nwere mmasị n‘etim mmọnwụ ohere. Ebumnuche e ji bagide edemede a bụ ka e si na ya
wee leghachi anya azụ n‘ihe mere n‘ọrụnka na mmọnwụ bụ Ijele n‘ebe o metụtara ọnọdụ ya
na ndụ ndị Igbo. Ọ bụ n‘ihi nke a ka o ji dị mkpa na e lebara anya n‘ọdachi ndị a ma chọpụta
ụzọ ọgbara ọhụụ a ga-esi wee gbochie ha. N‘otu aka ahụ e si n‘edemede a wee na-enye
akamgba ndị a chere Ijele ọnọdụ kwesịrị ya n‘etiti edemede ndị ọzọ e derela maka mmọnwụ
Ijele iji bawaye agụmagụ banyere ya. N‘ụzọ pụrụ iche ka e si n‘edemede a zipụtara ọhaneze
akamgba ndị ahụ chere ya. E mere nchọcha a n‘agụmagụ ọdịnala ma bụrụ n‘isiokwu e si na
ya ezipụta akamgba chere ọrụnka na mmọnwụ bụ Ijele. Ọ bụ site n‘ihe a hụrụ anya, ajụjụ
ọnụ, ọbakwụkwọ na ịntanetị ka e si weta ihe e dere n‘edemede a. Atụtụ e ji wee tụchaa
edemede nchọcha a bụ atụtụ mkpọghaobi nke na-ahụ ọrụnka ọbụla dị ka onyinyo na
ọdịmara zuru mba ọnụ. A tụchara ụsa dị iche iche e nwetara site n‘ihe a hụrụ, ajụjụ ọnụ,
ọbakwụkwọ na ịntanetị weta. Nke e si na ha wee chọpụta na e nwere otụtụ ihe mkpọbiụkwụ
na-agba mgba megide usoro obibi ndụ ndị Igbo n‘ebe o metụtara ọrụnka na mmọnwụ Ijele.
Edemede a ga-abara onye ọbụla na ọhaneze uru, ọ kachasị n‘ebe ọ gbasara inwe mmasị na
mmọnwụ ijele na ọrụnka ya.

Downloads

Published

2022-12-15