MPỤRỤICHE JI NA NKWENYE NDỊ IGBO

Authors

  • Edith Ngọzị Ọnụkawa, PhD

Abstract

Ụmị Edemede
Ndị Igbo nwere ọtụtụ akụkụ ọdịnala ma nke pụtakarịchara ihe n‘omenala ha bụ ji. E deela
ọtụtụ edemede banyere ji n‘omenala Igbo, ma edemede ndị a hiwekarịchara isi n‘emume iri
ji ndị Igbo. Ka o sila dị, edemede a na-akọwapụta ihe ndị mere ka ji bụrụ mkpụrụ akụkụ
pụtakarịchara ihe ma bụrụkwa nke ndị Igbo kacha akwanyere ugwu n‘omenala ha. Nchọcha
a gbasoro usoro nkọwa ma site n‘akwụkwọ dị n‘ọba akwụkwọ nweta ngwa ọrụ e ji mee
nchọcha a. Nchọpụta sitere na nchọcha a gosiri na ndị Igbo nwere nkwenye na ji nwere
agbara nke ya, tinyekwara ọtụtụ ihe ndi ọzọ ndị mere ya ọpụrụ iche n‘akụkụ ndị ọzọ. Na
mmechi, nchọcha a kwenyere n‘ezie na ji bụ isi mkpụrụ akụkụ ndị ọzọ e nwere n‘omenala
Igbo. Nchọcha a tụnyere aro ka ndị okenye kụziere ụmụaka ihe banyere mpụrụiche ji nwere,
mere e ji a kwanyere ya ugwu

Downloads

Published

2022-12-15