ỌMỤMỤ IGBO NA MAHADUM ABỤGHỊ ANỌMNÌSÌ

Authors

  • Aloysuis U. Umeodinka, PhD

Abstract

Ụmị edemede
Nchọcha a bụ nke isiokwu ya bụ ―Ọmụmụ Igbo na Mahadum Abụghị Anọmnisi‖. Otu n‘ime
ebumnuche ndị e ji maka ha eme nchọcha a bụ ịkọwa ihe bụ anọmnisi. Ebumnuche ndị ọzọ
bụ: ịchọpụta etu ndị na-amụ Igbo si anọ n‘isi, ihe na-akpata ọnọdụ ịnọ n‘isi, ọghọm na-esite
n‘ịnọ n‘isi na ihe a ga-emegasị iji wee belata ọnọdụ anọmnisi. Usoro anyị na-agbaso n‘ime
nchọcha a bụ usoro nchọcha kenkọwa nkịtị (descriptive research) na usoro nkọwa
kesọvee/usoro nkọwa keajụjụ ọnụ (descriptive survey research). Atụtụ nchọcha a bụ nke ike
agbụrụ (Ethnolinguistic vitality theory) na atụtụ njumafọ onwe (theory of self-esteem).
Nchọpụta nke mbụ bụ na ụmụakwụkwọ ngalaba Igbo amatachaghị uru dị n‘amụmamụ ha.
Nke ọzọ bụ na onye ọbụla gara mahadum bụ asambo digrii ka ọ na-achọ, etu ahụ ka ọ dịkwa
onye na-amụ Igbo. Ya bụ na ọrụ na-eche onye mụrụ ihe ọzọ na-echekwa onye mụrụ Igbo. A
chọpụtakwara na nchịkọta ihe a na-akụziri ha gbadokarịrị ụkwụ na sayensi asụsụ, nzikọrịta
ozi, kọmputa, amụmamụ na omenala.

Downloads

Published

2022-12-15