MMEMME ERIMJI ỌHỤRỤ N’OGHE

Authors

  • Christian E. C. Ọgwụdịle

Abstract

Ụmị Edemede
Mmemme iri ji ọhụrụ dị ka aha ya si dị bụ ihe a na-eme were eri ji izizi e gwuputara n‘ala. Ọ
bụ mmemme a ka a na-eme tupu onye ọbụla kọrọ ji enwee ike igwute nke ya rie. N‘obodo m
bụ Oghe ọ bụ mmemme na-ejikọta mmadụ niile ọnụ ma ndị kọrọ ji ma ndị akọghị ya.
Ebumnobi nchọcha a bụ ịkọ maka iri ji ọhụrụ n‘Oghe. Nwanchọcha lebekwara anya ma
kọwaa ma e nwere myiri na ndịiche dị n‘etu ndị Oghe si eri ji ọhụrụ na etu ndị Igbo ndị ọzọ
si eri ya. Usoro nchọcha a bụ na nwanchọcha gbara ụfọdụ ndị okenye na ndị maara etu e si
eme mmemme iri ji ọhụrụ ajụjụ ọnụ. Ọ gakwara n‘ọba akwụkwọ dị iche iche gụọ ụfọdụ ihe
ndị odee dere banyere oriri ji ọhụrụ n‘ala Igbo. Atụtụ a gbasoro mee nchọcha bụ atụtụ
nkọwa. Nchọpụta e mere gosiri na e nwere myiri na ndịiche dị n‘etu ndị Oghe si eri ji ọhụrụ
na etu ndị Igbo ụfọdụ si eri ya n‘ihi na ọkwa mba na-achị n‘olu n‘olu. Nwanchọcha tụrụ alo
ka ndị Igbo jidesie omenala oriri ji ọhụrụ aka ike ka ọ bụrụ mmemme a gaghị enwe ihe gaegbochi ya ịga n‘ihu, ka ọ bụrụ nwa tote, o tokwuru.

Downloads

Published

2022-12-15