ERIMJI ỌHỤRỤ: OMENALA NDỊ IGBO

Authors

  • Ikechukwu Okodo, PhD

Abstract

Ụmị Edemede
Omenala agbụrụ ọbụla bụ ihe e ji mara ha. Mpekele omenala ọbụla na-adị ụbara. Erimji
ọhụrụ bụ otu mpekele omenala e ji mara ndị Igbo malite n‘oge gboo rue ugbua. Ọtụtụ
mmadụ na-eleghara omenala anya n‘ụdị na ọ bụ ihe ndị ọgọ mmụọ nke na-emetụta mpekele
omenala a. Ọtụtụ amaghị uru ya. Usoro nchọcha a gbadoro ụkwụ na nkọwadaru ala. E
nwetara ngwa nchọcha n‘ọba akwụkwọ. Nwanchọcha si n‘ọba akwụkwọ weta ngwa
nchọcha ya. A chọpụtara na ji bụ eze akụkụ ndị ọzọ, nwere arụsị na-elekọta ya anya. Arụsị
ahụ bụ Ifejiọkụ nke nwere mgbanwe n‘aha ya site n‘otu ebe ruo n‘ebe ọzọ. Nchọcha a gaaba ọtụtụ uru. Uru ndị ahụ gụnyere na ndị mmadụ ga-amata ọkpụrụkpụ omenala ndị Igbo a
bụ erimji ọhụrụ, mata ka o si enye aka n‘agụmarọ, ịkpọkọta ndị mmadụ ọnụ n‘otu oge ka ha
mara ibe ha n‘otu n‘otu, ekpere na achụmaja iji yọta isiọma n‘aka Chineke wdg.

Downloads

Published

2022-12-15