IGBU ỌCHỤ DỊKA ỌGHỌM NYE NDỤ: NZIPỤTA YA N’AKWỤKWỌ NDỊ A HỌỌRỌ

Authors

  • Nnamdi Ani Department of Igbo, African and Communication Studies, Nnamdi Azikiwe University. Awka
  • Nkechinyere Nwokoye Department of Igbo, African and Communication Studies, Nnamdi Azikiwe University. Awka

Abstract

 

Igbu ọchụ abụrụla otu ihe jupụtara ụwa taa nakwa n’ala Naijirịa. Ọnọdụ a na-ebute nnukwu ọdachi n’obodo nakwa n’ezinaụlọ dị iche iche. O nweghị ụbọchị chi bọrọ, anaghị anụ maka ndị maọbụ onye nwụrụ ọnwụ n’ike site n’iji egbe, mma maọbụ site n’ihe mberede okporoụzọ. Ụfọdụ ndị jizi igbu mmadụ n’ike dịka ụzọ ha ji akpata ego, ebe ụfọdụ ji ya dịka ụzọ ha ga-eji nweta ọkwa ọchịchị. Ka ndị mmadụ si ewetara mmadụ ibe ha ọnwụ ike iji kpata ego n’oge a nakwa ka ọtụtụ ndị mmadụ aka ha dị ọcha si àlá àlà mmụọ n’ike n’oge a kpalitere mmụọ nwanchọcha ileba anya n’isiokwu a iji hụ etu ndị odee agụmagụ Igbo si zipụta ọnwụ ike n’ime akwụkwọ ha. Nchọcha a ga-eleba anya n’akwụkwọ agụmagụ abụọ ndị a họọrọ nke gụnyere iduuazị abụọ na ejije abụọ. Nwanchọcha gbasoro atụtụ ezi agwa Plato na Aristotle wubere nke nyere nwanchọcha ohere ileba anya n’agụmagụ wee zipụta ọnọdụ pụtara ìhè n’ime ha nke dubara agwa ndị nọ n’akwụkwọ ndị a ibutere mmadụ ọnwụ ike na nsogbu ezinaụlọ ahụ ọdachi ahụ dabidoro nwere. Nwanchọcha gbasoro usoro nchocha nke nkọwa iji mee ka isiokwu a doo anya. Nchọpụta gosịrị na e nwere ọtụtụ ihe butere e ji egbu mmadụ n’ike nke onye ọbụla nwere òkè na ọrụ ịhụ na ọnọdụ ọjọo a belatara maọbụ kwụsị kpamkpam. Ụfọdụ na-ebutere ibe ha ọnwụ ike n’ihi na ha chọrọ ịbụ eze, ebe a na-azọ akụnaụba, ekworo nakwa anyaụfụ d.g.z. Ndị ọchịchị ga-ahụ na ha wepụtara ọrụ nye ndị ntorọbịa iji gbochie igbu mmadụ n’ike; ma mee ka ndụ bụrụ ihe a na-echekwa nke ọma. Nchọcha a ga-enyere ndị Igbo aka iwepụ aka n’ihe ọbụla ga-eduba ha n’igbu mmadụ n’ike. Ọ ga-emekwa ka mmadụ malite inwe ezi ịhụnanya n’ebe mmadụ ibe ya nọ nke ga-eme ka mmadụ iji aka ya butere mmadụ ibe ya ọnwụ ike laa kpamkpam.

Downloads

Published

2024-02-21

Issue

Section

Articles