ECHICHE NDỊ IGBO BANYERE IME MKPUKE NA BEBI MAMA NA NDỤ ỤMỤ AGBỌGHỌ: NZIPỤTA HA N’AGỤMAGỤ OBIECHINA NA ONYE KPAA NKỤ AHỤHỤ

Authors

  • Chioma C. Anagor Department of IGBO, AFRICAN AND ASIAN STUDIES, Faculty Of Arts in Nnamdi Azikiwe University

Keywords:

Bebi Mama, Ime Mkpuke

Abstract

Ụmịedemede
Ime ọkwa abụghị okwu ọhụụ na ntị ndị mmadụ n’oge a ka ọ dị n’oge gboo n’ihi na ọtụtụ ụmụ agbọghọ jizi ya mere akaọrụ na ụzọ ha si akapụ ụmụ nwoke ejideghị onwe ha ego n’aka. N’oge gboo, nwa agbọghọ ịtụta ime n’ụlọ nna ya bụ ajọ agwa ma bụrụ otu ihe na-ewetara ezinaụlọ ọbụla ajọ aha ma na-ebutere ụmụaka nwaanyị ndị ọzọ nọ n’ezinaụlọ ahụ mkpọchuihu mana n’oge a, mmepe obodo na njepụ agbanweela ọtụtụ ihe na nkwenye, omenala na obibindụ ndị Igbo. Ọ dịghịkwa mgbarụihu ọhanaeze naezipụta naanị ihe e mere bụ na a gbanwere aha ya si na ikwu na nwa agbọghọ tụtara ime ọkwa baa ya “bebi mama”. Mgbanwe aha a mere ya ka ọ dị ka akaọrụ. Ihe ndị a kpaliri mmụọ nchọcha a ileba anya n’agụmagụ Obiechina na Onye Kpaa Nkụ Ahụhụ iji zipụta
ka ndị Igbo si egosipụta mgbaru ihu mgbe nwa agbọghọ tụtara ime be nne na nna ya ma zipụtakwa echiche ndị Igbo banyere ezinaụlọ nwata ahụ si na ya. Ederede a gbasoro usoro nkọwa ma were atụtụ saikoanalisis nke Sigmund Freud tụpụtara (1856-1939) iji mee ka isiokwu a doo anya. A chọpụtara na e nwekwara ụmụ agbọghọ na-akpacha anya tụrụ ime iji kechie nwoke ka ọ lụwa ha ma nwee ndị ọlụlụ abụghị nsogbu ha. Naanị ihe ha chọrọ bụ iji afọ ime napụtawa nwoke ego ha ji ebi ndụ ma na-elekọta ezinaụlọ ha anya nke mere na n’oge a, ha na-achọ nwoke kpatara ego maọbụ onye nwere ezi aha n’obodo ha ga-adịrị ime ma onye ahụ ọ lụọla nwaanyị ma ọ lụbeghị abụghị ihe gbasara ha. Naanị ka ha si n’ụzọ ahụ gbanarị ụbịam na ogbenye na ndụ ha. A hụkwara na ọ bụ ndị selebriti malitere akparamaagwa ọjọọ a wee kesaa ya n’akụkụ niile. 

Downloads

Published

2024-02-20

Issue

Section

Articles