About the Journal

Odezuruigbo bụ Jọnal nke Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afịrịka na Eshia, Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka. Aha a bụ okwu Igbo nke pụtara “Ihe jezuru ebe niile”. Ude ya na-edezu na mba niile site na Gọọgụl na Ntaneetị. Nke a mere na Jonal a, dị ka aha ya gosipụtara, metụtara mmadụ niile na mba niile. Ebumnuche Jọnal Odezuruigbo hiwere isi n’ime ka a mara na ọ dị mkpa iji asụsụ Igbo depụta edemede nchọcha e nyochara nke ọma. Nke a ga-enye aka n’ịkwalite asụsụ Igbo, ma mee ka ọ na-eto eto. Ọ na-anabatakwa edemede e dere na Bekee nke nakwa ewelite ogo asụsụ, omenala, amamihe, nsirihụ ụwa na njirimara ndị Igbo. Nke a pụtara na ọ na-anabata edemede na atụmatụ ọ bụla metụtara ọdịmma ndị mmadụ, akụkọ ntọala, mmekọrịta mmadụ na ibe ya, agụmagụ, ekpemekpe, omenala, agụmakwụkwọ, ọchịchị, nka na ụzụ, w.d.g.

Edemede na-adị n’Odezuruigbo nwere ike bụrụ edemede mmekọrịta zuru ụwa ọnụ, nke mmụta si na ya ga-ewulite asụsụ Igbo. Ọ nwekwara ike bụrụ nke si mba Eshia na Afịrịka kpọmkwem, nke asụsụ Igbo ga-esi na ya nwee mmụta na mbawanye amamihe. Onye amaghị, ibe ezi ya.

Edemede nchọcha a na-anabata n’Odezuruigbo bụ nke a kpachapụrụ anya, pịa aka, lebamie ha anya n’ime, weteruo ha n’ogo edemede otu mmụta n’ụwa dum na-eṅomi. Edemede ndị agafeghị n’anya agịga nnyocha, a ga-ezighachiri ha ndị dere ha.

Mmebere edemede Odezuruigbo nwere ike ịdị ọtụtụ. Nke a na-egosi ụdị mmasị na ntụkwasị obi ndị odee nwere na ya.

N’otu aka ahụ, okwu ọ bụla na atụmaro ọ bụla e bipụtara n’Odezuruigbo bụkwa nke ndị dere ha. Ọ bụghị nke Onye isi nhazi ma ọ bụ Onye mbipụta. Ọrụ Onye isi nhazi jedebere n’ịhazi edemede. A na-ebipụta Jọnal Odezuruigbo kwa afọ, tụmadị ugboro abụọ n’afọ.

Onye Nhazi