ASỊNILU ỤMỤ ANỤMANỤ NA NSIRIHỤ NDỊ IGBO: NZIPỤTA ỌWA ECHICHE HA NWERE N’USORO AMỤMAMỤ NCHEKE

Authors

  • Florence Uju Ibeh PhD
  • Ifeyinwa Cordelia Isidienu PhD

Abstract

Ụmị edemede
Nchọcha a bụ ntụcha agwara na njirimara asịnilu ụmụ anụmanụ na nsirihụ ndị Igbo n’usoro
amụmamụ asụsụ ncheke. Amụmamụ asụsụ ncheke bụ amụmamụ na-elekwasị anya na nghọta.
Ọ na- achọ ịmata ka mmadụ si echedebe echiche. Asịnilu so na mbụrụ n’amụmamụ ncheke ma
bụrụ atụmatụ okwu na-adị n’ụdị okwu ozi nke a na-asị n’otu onye ma ọ bụ otu ihe kwuru otu
ihe ma ọ bụ ihe ọzọ. Ihe na-ekwu ihe ahụ nwere ike ịbụ ihe na-eku ume ma ọ bụ ihe anaghi eku
ume. Ihe kpalitere nchọcha a bụ na o nwebeghi ebe nwa nchọcha hụrụla e ji atụtụ ọwa echiche
mee nchọcha n’asịnilu. Ebumnobi nchọcha a bụ ịkọwa asịnilu, njirimara ya na ịchọpụta ọwa
echiche a ga-eji kọwapụta asịnilu ụmụ anụmanụ a họọrọ. Usoro nchọcha a bụ sọevee
kenkọwasị. E wetara ngwa ọrụ nchọcha a n’akwụkwọ ọgụgụ dị iche iche, ajụjụ ọnụ a
gbakwara ụfọdụ ndị mmadụ tinyere iji usoro nnọrọmele na ijikwa ọgụgụ isi dị ka ndị Igbo
chepụta ụfọdụ ngwa ọrụ. Atụtụ e jiri mee nchọcha a bụ atụtụ ndịna ncheke. Ka e mechara
ntụcha, e si na nkọwa asịnilu hụ ndịiche ya na ilu. Nchọpụta ọzọ bụ na e si n’agwara na
njirimara anụmanụ wube asịnilu e jiri anụmanụ ndị a tụọ nke mere na anụ a sị na ọ sịrị, naadị ka ọ sịrị ihe ahụ n’eziokwu. Ọzọ bụ na atụtụ nhụta kọwara ọwa echiche mfe atọ pụtara ihe
n’asịnilu e jiri mee nchọcha. Ha bụ ọwa ndịnime, ndịnike na ndịnụzọ. Nchọcha a ga-abara ndị
nchọcha, ndị nkuzi na ụmụ akwụkwọ uru. Maka nhịamahụ e nwetara n’ịtapịa ụfọdụ n’Igbo ka
nchọcha a ji atụ aro ka ndị nwere mmasị n’ịmụ asụsụ Igbo gaa n’ihu n’ iji atụtụ a mekwuo
nchọcha ka ihe ndị e merela na ya bawanyekwuo.

Downloads

Published

2022-12-11