AKWAMOZU NWAỌKPỤ NA NNEWI N’OGE UGBU A: MGBANWE NA NSOGBU YA

Authors

  • Onyekelu Ann C
  • Ejioforbiri Chidimma A

Keywords:

Akwamozu

Abstract

Ụmị edemede
Akwamozu nwaọkpụ bụ otu n'ime omenala e nwere na Nnewi nke e ji eme ka mkpụrụobi nwaọkpụ
nwụrụ anwụ laruo n'udo. Usoro akwamozu na Nnewi malitere n'oge gboo dịwa ire mana ọtụtụ
mgbanwe na nleghara anya batara na ya site n'ọbịbịa ụka Kraịst nakwa mmepe obodo. Mgbanwe
ndị a batara n'akwamozu nwaọkpụ mere ka ndị mmadụ leghara ụfọdụ mmemme a na-eme n'ime
akwamozu a anya, nke butere nsogbu dị iche iche dị ka ọnwụ ike, ajọ ọrịa, ndaghachi azụ n'ezinụlọ
dị iche iche nakwa nkewa na ịkpọ asị n’etiti ndị ụka Kraịst na ndị anaghị eje ụka Kraịst. Nke a
kpalitere mmụọ nwanchọcha ime nchọcha n'isi okwu a iji chọpụta kpọmkwem ihe na-ebute nsogbu
ndị a ma chọpụta ụzọ a ga-esi gbanahụ nsogbu ndị a. A gbasoro usoro sòvee wee mee nchọcha a.
A gbara ndị okenye asatọ nọ n'agbata afọ iri isii na iri asatọ ajụjụ ọnụ iji nweta ụsa dabara adaba.
E mekwara nnyocha agụmagụ iji chọpụta ihe ndị ọzọ kwugara maka nwaọkpụ, akwamozu nakwa
akwamozu nwaọkpụ. A chọpụtara na e nweela mgbanwe dị iche iche n'ihe gbasara ili ozu
nwaọkpụ, ịkwa ozu nwaọkpụ, na ibuna ngịga. Nchọcha a ga-abara ndị Nnewi nakwa obodo niile
gbara ya gburugburu uru iji ghọta ihe dị n'akwamozu nwaọkpụ ma gbanahụ ntaramahụhụ nwere
ike isi na ya pụta. Na nchịkọta, ndị Nnewi kwesiri ịkwa nwaọkpụ ha ọbụla nwụrụ anwụ dị ka
nkwenye na ekpemekpe ya si dị, ka udo, agamnihu na ịhụnanya wee dị n'obodo Nnewi

Downloads

Published

2022-12-11