Amụtaghị Nwa n’Alụmdi Na Nwunye n’Ala Igbo: Ọnọdụ ya n’Iduuazị A Họọrọ

Authors

  • Winifred Chiazo Okeke
  • Nonyelum Joy Moghalu (PhD)

Keywords:

Amụtaghị Nwa

Abstract

Ụmị edemede
Ọmụmụ bụ ọrụ na ngọzi pụrụ iche na-esite n’ Alụmdi na Nwunye apụta nke bụ otu ụzọ agbụrụ
si abawanye. Amụtaghị nwa bụ otu ihe na-eme alụmalụ ọ dị ka nke ihe ụtọ na-adịghị na ya,
nke a bụ n’ihi ọtụtụ ihe nhujuanya di na nwunye na-enweta n’aka mmadụ ọha obodo na tinyere
ka omenala. Ebumnobi nchọcha a bụ/ịchọpụta ihe ndị na-ebute ọnọdụ amụtaghị nwa, ọzọ
bụịchọpụta ụzọ ndị ahụ dị iche iche Amụtaghị nwa si ewetara di na nwunye ihe mgbu na
mmekpaahụ, ịchọpụta ụzọ a ga-esi gbochie nsogbu ọnọdụamụtaghị nwa na-eweta n’ alụmdi na
nwunye. A gbasoro usoro sọveee wee mee nchọcha a, ma were atụtụ usoro Ezinaụlọ nke Bowen
n’afọ 1950 wee nyocha akwụkwọ agụmagụ ndị a họọrọ; Onye Chi Ya Akwụtaghị na Otu Iko
mmanya M Ñụrụ Afọ Asaa. A chọpụtara na ihe ndị na-ebute ọnọdụ amụtaghị nwa na-abụ site
n’ekerechi, akparamagwa ọjọọ, na etozughị oke n’ihe ndị ahụ e ji abụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị.
Nchọcha a zipụtakwara nsogbu dị iche iche amụtaghị nwa na-eweta n’ọnọdụ Alụmdi na
Nwunye, ma tinyekwa aro ka di na nwunye bi na ezinaụlọ nwee ike inwe mmasị ịkute nwa.
Nchọcha a ga-abara ndị ntọrọbịa, ọha mmadụ, ezinaụlọ niile kachasi ndị n’ọnọdụAmụtaghị
nwa uru site n’inye ntuziaka etu a gas-esi gbochcie nsogbu amụtaghị nwa.

Downloads

Published

2022-12-11