MWEPỤ N’OLU ỌKA SITE N’USORO ỤTỌASỤSỤ NNWOGHARỊ

Authors

  • Chiamaka Helen Akabogu
  • Christian E. C. Ogwudile (PhD)

Abstract

Ụmị edemede
Nchọcha a nke isiokwu ya bụ “Mwepụ n’olu Ọka site n’usoro ụtọasụsụ Nnwogharị” bụ nke
lebara anya n’ụdị mwepụ dị iche iche na-apụta n’olu Ọka. Ihe kpalitere mmụọ nwa nchọcha
ileba anya n’isiokwu a bụ na e nwebeghi ọtụtụ nchọcha e merela n’isiokwu a mbụ. Ebumnobi
nchọcha a bụ iji lebaa anya ma tụpụta ụdị mgbanwe dị iche iche na-adapụta n’olu Ọka site
n’iji usoro ụtọasụsụ nnwogharị wee nyochaa ya. Ọzọ bụ ịchọpụta ka olu Ọka si ahazi
mkpụrụokwu na ndokọ okwu, ọ kachasị mgbe ọ na-ezipụta mwepụ mkpụrụasụsụ, mkpụrụokwu
ma ọ bụ nkebiokwu. Nchọcha a bụ nchọcha kesọvee, a gbasokwara usoro Atụtụ Ụtọasụsụ
Nnwogharị wee mee ya. Site na nchọcha a, a chọpụtara na mgbanwe pụtara n’olu Ọka dị ka o
si pụta n’olu Izugbe. A chọpụtakwara na ụfọdụ irighiri okwu dị na ndokọ omimi na-apụ na
ndokọ elu nke ahịrịokwu n’ihi nnwogharị nke ahịrịokwu ahụ gabigara. Nchọcha a ga-abara
ọtụtụ ndị uru, ọ kachasị ndị amụmamụ ụtọasụsụ Igbo. Nwa nchọcha na-atụkwazị aro ka e were
usoro ụtọasụsụ nnwogharị lebakwuo anya n’olu asụsụ Igbo dị iche iche iji bawanye ngwa
ọmụmụ asụsụ Igbo.

Downloads

Published

2021-11-01