NGOSI OGE NDỊNAZỤ NA NDỊNIHU N’OLU IKWO

Authors

  • Dimebo, Ifunanya Nzubechukwu
  • Ugochukwu, Chinweude N.

Abstract

Ụmị edemede
Asụsụ Igbo dị ka asụsụ mba ụwa nwere olumba dị iche iche ndị na-enye aka ikwalite ya. Olu
Ikwo bụ otu n’ime olumba dị n’asụsụ Igbo nke tara akpụ ma na-agbagwojukwa ọtụtụ ndị Igbo
anya. Ngosi oge bụ nkeji ngwaa dị mkpa n’ụtọasụsụ ma bụrụ nke kwesiri ka e leba anya na ya
n’olundị Igbo ụfọdụ nwere ndịiche pụtara ihe dị ka olu Ikwo. Ọ bụ ezie na e nweela ọtụtụ ihe
e derela gbasara ngosi oge mana e nwekebeghị nke e deerela n’olu Ikwo. Ọ bụ nke a kpaliri
mmụọ ọchọcha iji bagide edemede a. Ebumnobi nchọcha a bụ ịkọwa ngosi oge; igosi nzipụta
ngosi oge ndịnazụ n’olu Ikwo; iziputa ngosi oge ndịnihu n’olu Ikwo tinyere igosi myiri na
ndịiche dị n’etiti nke olu Ikwo na nke Igbo izugbe. Ọchọcha gbara mmadụ iri atọ ajụjụ ọnụ iji
nweta ihe a chọrọ banyere edemede a. A gbasoro usoro nkọwa wee zipụta ngwa nchọcha ma
tụchaa ha. Ọchọcha chọpụtara na olu Ikwo nwere ngosi oge ndịnazụ na ndịnihu mana nzipụta
ha dị iche na nke Igbo izugbe. Ọchọcha chịkọtara edemede a ma weta ya n’isi njedebe.

Downloads

Published

2021-11-01