Ọmụmụ Asụsụ Igbo ka Ọ dị Taa n’Ụlọ Akwụkwọ dịgasị na Steeti Enugwu, Naịjirịa

Authors

  • Christian E. C. Ogwudile

Abstract

Ụmị edemede
Isiokwu nchọcha a bụ ọmụmụ asụsụ Igbo ka ọ dị taa n’ụlọ akwụkwọ dịgasị na Steeti Enugwu,
Naịjirịa. Ebumnobi nchọcha a bụ ile anya mara ihe a ga-eme ka ọnọdụ ọmụmụ asụsụ Igbo
gbanwee n’ọtụtụ ụlọ akwụkwọ dị na Steeti ahụ, ma nwee ike ịkwụrụ chịm dị ka ogbo ya ndị
ọzọ dị ka Awụsa na Yoruba. Ọzọ bụ ịmata ihe na-ebute ọdịda nye ya bụ asụsụ n’ụlọ akwụkwọ
ndị a. Atụtụ a gbasoro mee nchọcha a bụ atụtụ njirime. Nchọpụta gosiri na ụfọdụ ihe ndị naeso ebutere asụsụ Igbo ọdachi bụ ụfọdụ ndị nne na nna ugbu a. Ụfọdụ n’ime ha anaghị eji
asụsụ Igbo azulite ụmụ ha n’ezinaụlọ ha dị iche iche. N’aka nke bụ na ọtụtụ ụlọ akwụkwọna
steeti Enugwu, ọkachasị nke ndị nkịtị nwe anaghị akuzi asụsụ Igbo. Ụmụ amaala Igbo ufọdụ
enweghị mmasị n’isụ asụsụ Igbo na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Nke ka njọ bụ na gọmentị emeghizi ya
ka ọ bụrụ iwu na nwa amaala Igbo ọ bụla ga-eleleriri asụsụ Igbo n’ule Wayekị. Ụfọdụ ndị naakuzi ya, ejighị ya kpọrọ ihe. Ha anakwughị ekwe ka ụmụ akwkwọ sụọ Ịgbo na klasị. Onye sụọ
ya, a daa ya nra. Ha na-ahụtazị asụsụ Igbo dị ka nke ndị iti mpataka, na-amaghị ihe ọ bụla. A
gbasoro usoro sovee were mee nchọcha a. Ọchọcha tụpụtara aro ndị a: ndị Igbo niile ga-agba
mbọ jiri naanị asụsụ Ịgbo azụlite ụmụ ha karịa iji asụsụ Bekee. Gọọmentị etiti kwesiri ime ya
ka ọ bụrụ iwu na ụlọ akwụkwọ niile dị na Steeti Enugwu na kwa ala Igbo gbaa gburugburu ga
na-amụ asụsụ Igbo bido n’ọtaakara ruo na koleji. Ha kwesikwara ime ya ka ọ bụrụ iwu na
nwa akwụkwọ ọ bụla bụ onye Igbo nọ n’ụlọ akwụkwọ koleji na steeti Igbo, ga-eleleriri asụsụ
Igbo n’ule wayekị. Ndị mbipụta akwụkwo na ndị nta akụkọ ga-agba mbọ hụ na ha na-ebipụta
ma na-edepụta akwụkwọ na ozi ha n’asụsụ Igbo karịa n’asụsụ Bekee n’ihi na ebe onye bi ka ọ
na-awachi.

Downloads

Published

2021-11-01