ILU METỤTARA NKWỤ NA AKWỤ N’ALA IGBO

Authors

  • Onyinye Constance Amamgbo

Keywords:

Ilu,, Nkwụ,, Akwụ,, na Ala Igbo

Abstract

Ụmị edemede
Nkwụ bụ otu n’ime osisi ndị Igbo ji eme ọnụ. Nke a na-egosị na ọ bụ isi sekpụ ntị n’osisi e
nwere n’ala Igbo. Ọ bụ na nkwụ ka e si enweta akwụ e ji esi nri niile a na-esi n’ala Igbo. Ọ
bụ mkpa a akwụ na nkwụ dị kpalitere mmụọ nwa nchọcha ileba anya n’isi okwu a bụ “Ilu
Metụtara Nkwụ na Akwụ N’Ala Igbo”. Otu n’ime ebumnuche nchọcha a bụ ime ka a mata
na e nwere ilu Igbo ndị na-arụtụ aka na nkwụ na akwụ. Ebumnuuche nke abụọ bụ ịkpọsa
ilu ndị ahụ na-emetụta nkwụ na akwụ. Nke atọ bụ ime ka a mata mgbe e ji webata ilu ndị
a n’okwu Igbo. Atụtụ nchọcha bụ atụtụ njieme. Usoro nwa nchọcha ji eme nchọcha a bụ
usoro nkọwasị. Otu n’ime nchọpụta nchọcha a bụ na ilu Igbo gbasara agbasa ka ụkpaka.
Nchọpụta nke abụọ na-egosị na, site n’ilu Igbo, nkwụ na akwụ baara ndị Igbo ọtụtụ uru. A
chọpụtakwara na nchọcha a ga-abara ụmụ akwụkwọ, ndị nkuzi na ndị Igbo niile uru.
N’ikpeazụ, nwa nchọcha mejupụtara ebumnuuche ya site n’ime ka nwaafọ Igbo ọ bụla
mata na ilu Igbo bụ ihe metụtara akụkụ dị iche iche nke ọ bụ naanị onye chemiri echiche
ime ga-eji ya rụọ ọrụ. Na nchịkọta, nchọcha a ga-enyere ụmụakwụkwọ, ndị nkuzi, ọhanaeze
aka ịmata mkpa ilu dị na etu o siri metụta osisi ụfọdụ e nwere n’ala Igbo. Nwa nchọcha naatụ aro ka obodo ọ bụla dị n’ala Igbo jiri osisi ọ bụla ha nwere were kpọrọ ihe

Downloads

Published

2021-11-01