About the Journal
JỌNAL OZURU ỤWA, NKE NGALABA AMỤMAMỤ IGBO, AFRỊKA NA ESHIA (AN INTERNATIONAL JOURNAL OF IGBO, AFRICAN AND ASIAN STUDIES)
Current Issue

Nkọwa Jonal Odezuruigbo
Odezuruigbo bụ Jonal nke Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afirika na Nzikọrịta Ozi,
Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka. Aha a bụ okwu Igbo nke pụtara “Ihe jezuru
ebe niile”. Ude ya na-edezu na mba niile site na Gọọgụl na Ntaneetị. Nke a
mere na Jonal a, dị ka aha ya gosipụtara, metụtara mmadụ niile na mba niile.
Ebumnuche Jonal Odezuruigbo hiwere isi n’ime ka a mara na ọ dị mkpa iji
asụsụ Igbo depụta edemede nchọcha enyochara nke ọma. Nke a ga-enye aka
n’ịkwalite asụsụ Igbo, ma mee ka ọ na-eto eto. Ọ na-anabatakwa edemede e
dere na Bekee nke nakwa ewelite ogo asụsụ, omenala, amamihe, nsirihụ ụwa
na njirimara ndị Igbo. Nke a pụtara na ọ na-anabata edemede na atụmatụ ọbụla
metụtara ọdịmma ndị mmadụ, akụkọ ntọala, mmekọrịta mmadụ na ibe ya,
agụmagụ, ekpemekpe, omenala, agụmakwụkwọ, ọchịchị, nka na ụzụ, w.d.g.
Edemede na-adị n’Odezuruigbo nwere ike bụrụ edemede mmekọrịta zuru ụwa
ọnụ, nke mmụta si na ya ga-ewulite asụsụ Igbo. Ọ nwekwara ike bụrụ nke si
mba Eshia na Afrịka kpọmkwem, nke asụsụ Igbo ga-esi na ya nwee mmụta na
mbawanye amamihe. Onye amaghị, ibe ezi ya.
Edemede nchọcha a na-anabata n’Odezuruigbo bụ nke a kpachapụrụ anya, pịa
aka, lebamie ha anya n’ime, weteruo ha n’ogo edemede otu mmụta n’ụwa dum
na-eṅomi. Edemede ndị agafeghị n’anya agịga nnyocha, a ga-ezighachiri ha ndị
dere ha.
Mmebere edemede Odezuruigbo nwere ike ịdị ọtụtụ. Nke a na-egosi ụdị mmasị
na ntụkwasị obi ndị odee nwere na ya.
N’otu aka ahụ, okwu ọbụla na atụmaro ọ bụla e bipụtara n’Odezuruigbo bụkwa
nke ndị dere ha. Ọ bụghị nke Onye isi nhazi ma ọ bụ Onye mbipụta. Ọrụ Onye
isi nhazi jedebere n’ịhazi edemede. A na-ebipụta Jonal Odezuruigbo kwa afọ,
tụmadị ugboro abụọ n’afọ.
Onye isi Ngalaba/Onye Nhazi